OLISA by Jude Nnam
OLISA Lyrics
BASS INTRO:
K’anyi kelee Ya n’orulu Ya.
Kelee Ya n’okwesiri Ya;
Kelee Ya n’oziere Ya. Kelee Ya. Kunie k’anyi…
BASS CONT: kelee Ya n’orulu Ya. Kelee Ya n’okwesiri Ya. Kelee Ya n’oziere Ya. Kelee Ya; Kunie
REF:
k’anyi kelee Ya n’oruru Ya.
Kelee Ya n’okwesiri Ya. Kelee Ya n’oziere Ya.
Kelee Ya Nna! Leken’iheoma nile di n’uwa, ha busi oru aka Gi!
Chukwu Nna nk’igwe, Oruolo Gi! O kwesiri Gi! Oziere Gi! Ekele diri Gi.
Otito diri Gi! Ebube zuru Gi ahu, Nna! Olisa I meela! Ihe di ebube k’In’eme! Ih’Imere juru m afo. Ih’Imere juru m anya!
Aka m di n’elu! Oruolu Gi! Ekele diri Gi! Okwesiri Gi. Otito diri Gi! Oziere Gi= Igwe n’eche ndu mo!
Aka m di n’elu! Oruolo Gi, Ekele diri Gi! Okwesiri Gi. Otito diri Gi! Oziere Gi- Chi n’eme mma!
TENOR:
kelee Ya; jee jaa Ya mma! To-be Olisa nk’igwe, kele Chineke nk’igwe ndi agha;//
REF: kelee Ya, jee jaa Ya mma! To-be Olisa nk’igwe, kele Chineke nk’igwe ndi agha.
Leken’iheoma nile di n’uwa, ha busi oru aka Gi!///
Oruolu Gi; Okwesiri Gi! Oziere Gi! Ekele diri Gi. Otito diri Gi.
Ebube zuru Gi ahu, eh! Olisa I melaa! Ihe di ebube k’I neme! I h’Imere juru m afo.
I h’Imere juru m anya! Aka m di n’elu ekele— diri Gi, otito diri Gi, Olisa mo, onye di ka Gi?
Akam di n’elu ekele– diri Gi otito—diri Gi, O Chineke, Onye mma!
SOPRANO:
REF: K’anyi kelee, kelee–Olisa, k’anyi jee jaa Ya mma.
K’anyi kelee kelee Olisa nk’igwe! Chineke mo! Ogbaka eje ogu! Obu Ya n’elekota mo!
Obu Ya n’echekwaba mo! Olisa e gboo!
Olisa emeka! Olisebuluwa mma-mma, biko nar’ekele. Olisa doo———————;
Aka m di n’elu Oruolu Gi. Ekele diri Gi! Okwesiri Gi. Otito diri Gi! Oziere Gi- Igwe n’eche ndu mo!
Aka m di n’elu, Oruolu Gi. Ekele diri Gi! Okwesiri Gi. Otito diri Gi! Oziere Gi-Chi n’eme mma!
ALTO:
REF: K’anyi kelee kelee –Olisa jee jee jaa Ya mma.
Tobe Olisa nk’igwe. Obu Ya ka m ji aba! Obu Ya n’elekota mo! Obu Ya n’echekwaba mo!
Olisa egboo!– Olisa emeka! Olisebuluwa doo, —-nar’ekele.
Olisa I melaa! Ih’ebube k’In’eme! Ma iru ma azu m, ihe di ebube! O juru m anya!
Aka m di n’elu! Oruolu Gi. Ekele diri Gi! Okwesiri Gi! Otito diri Gi! Oziere Gi- Igwe n’eche ndu mo!
Aka m di n’elu! Oruolu Gi. Ekele diri Gi! Okwesiri Gi. Otito diri Gi! O ziere Gi-Chi n’eme mma!
VERSES: 1.
SOP & ALTO: Udara dara n’ala emetugo aja; Azu bi na mmiri adighi ago agugo mmiri.
Anyi bi n’uwa, njo zur’anyi ahu! Onye njo ka m bu, man’Olisa elegh’anya na njo mo.
Onwur’onwu n’obe, Onwu Ya k’Ojiri zoo mo (B-T). Ke lee lee lee nuo!
REFRAIN/// TENOR:
Olisa kwe, ihe nile ga-adi mma! REF BASS: Olisa bi n’igwe, I karisiri! Narekel’anyio, Nna!
REFRAIN///
2. SOP & ALTO: Chukwu kere nwa agu agaghi ekwe ka nwa agu taa ahihia.
Chi ma mkpa moo, I n’egboro m mkpa mo. Onyinye Inyere mo—bar’uba. (Nna),
ya ka m ji eme onu, ya ka m ji eme ngala. Agu n’eche mba moo– Olisa Imeka (B-T) Ke lee lee nuo!
REFRAIN/// TENOR:
Olisa kwe, ihe nile ga-adi mma!
REF BASS:
Olisa bi n’igwe, I karisiri! Narekel’anyio, Nna!
REFRAIN///
3. SOP & ALTO: Nwa n’eso okenye, otaghi ose otaa oji, makana aka n’aga n’akuku oku,
n’agakwa n’akuku onu. Onye n’eso Gi (n’azu) Chineke,
Onwer’ihe nile. Olisebuluwa n’azu mo, O dighi ihe koro mo.
Ochendo mo! Agu bata mgbada awar’oso!(B-T).
Ke lee lee lee nuo!
REFRAIN/// TENOR:
Olisa kwe, ihe nile ga-adi mma!
REF BASS: Olisa bi n’igwe, I karisiri! Narekel’anyio, Nna!
REFRAIN///
Do well to share to friends…. Comments are appreciated!
Please I seriously need this song